TB Joshua bụbu onyeisi otu ụlọụka kachasị n’ụwa niile manyere aka na mpụ dị icheiche dịka otu nyocha nke BBC mere gosiri.
Akụkọ akaebe si n’ọnụ ọtụtụ ndị mmadụ pụta kwuru na ikekwe Joshu na-emetọ ụmụ agbọghọ si mba ụwa dị iche iche kwa izu n’ime ihe ruru afọ iri abụọ.
Ịdọakanantị: Akụkọ a metụtara okwu mmegbu, idinan’ike nakwa mmerụ onwe ahụ.
N’afọ 2002, ka otu nwaanyị a na-akpọ Rae furu efu.
Mgbe ikpeazụ a hụrụ ya, ọ nọ na Mahadum Brighton ebe ọ na-agụ “Graphic design”. Rae mara mma ma bụrụ onye a ma ama.
“Ọ dị m ka ọ nwụọla mana enweghị m ike iruru ya uju” bụ ihe enyi ya mgbe ahụ akpọrọ Carla kwuru.
Ọtụtụ izu tupu nke a e mee, ya na Rae gara Naijiria ịchọta otu nwoke a sị ji aka agwọ ndị mmadụ ọrịa. Ọ bụ onye ukochukwu nwere afọ ọnụ ojii na-eyi uwe ọcha. Aha ya bụ TB Joshua ndị nso ya na-akpọ ya “Onye amụma”
Rae na Carla kwadoro ịga ụlọụka ahụ bụ Synagogue Church of All Nations [Scoan] naanị otu izu mana Rae anaghị be ya ọzọ. Ọ kwara gawa be Joshua.
“A hapụrụ m ya ebe ahụ, agaghị m a gbaghara onwe m” ka Carla kwuru dịka ọ na-ebe akwa.
Ụlọụka ahụ dịka otu nke Goth dị n’Ikotun dị na Legọs.
Joshua bụ onye haziri ụlọ ogogo iri na abụọ dị ebe ahụ bụ ebe ya na ndị nsọ ya bi.
Ọ rụrụ ụzọ atọ e ji abanye n’ime mkpuru ya, ụzọ atọ e ji abanye ime ụlọ nke yanwa. Otu ime ụlọ ekpere nke enyo juru na ya nakwa ebe akpọrọ “ụlọọgwụ” dị n’ala ebe ahụ.
Anyị gbara mmadụ iri abụọ na ise ajụjụ ọnụ bụ ndị biri n’ime ebe ahụ. Ha kọọ akụkọ ihe dị egwu na-eme n’ime ebe ahụ dịka agbanari go ụwa n’onwe ya.
N’ime ụmụ nwanyị ndị agbara ajụjụ ọnụ, ụfọdụ sị na Joshua metọrọ ha, ụfọdụ si na o na-edina ha n’ike ebe ndị ọzọ kwuru na ọ manyere ha tepu afọ ime mgbe ha tụrụ ime.
Taa, Rae alaghachila Ingland ebe obi n’otu ime obodo. Ọ na-achi ọchị mana o nwere ihe edochaghi anya maka ya.
“Na mpụta ihe niile dị mma mana ezughi m ezu” ka o kwuru.
Mgbe Rae na-aza ajụjụ maka afọ kwuru afọ ndị o biri na Legọs, ọ na-ejisi onwe ya ike. Ụfọdụ oge, ịhụ na ihu ya gbanwere. O biro afọ 12 n’ụlọ Joshua.
“Akụkọ dịka akụkọ na-eyi egwu, ọ dịka ihe onyonyo, mana ọ bụ eziokwu”.
Nyocha a were afọ abụọ bụkwa nke ihe karịrị ndị ntaakụkọ BBC 15 n’ala atọ jikọrọ aka mee. Ngalaba mbaụwa dị icheiche gụnyere Open Democracy binyere aka na ya.
Ha kpokotara ihe onyonyo ndị ochie, akwụkwọ ndekọ nakwa elekere kwuru elekere ebe agbara ndị mmadụ ajụjụ ọnụ iji chọpụta akụkọ Rae na ndị ọzọ.
Ihe karịrị mmadụ 25 si mba Briten, Naịjirịa, Gana, Amerịka, Jamini na Saụt Afrịka gbara akaebe maka ihe ndụ dị ka ya be Joshua ka nke kachasị dị ọhụrụ si afọ 2019.
Ụlọụka Scoan jụrụ ịsa ebubo ndị e boro ha mana ha kwuru na ebubo ndị ochie enweghi isi na ọdụ.
Ndị na-agabu ụka ahụ ochie kwuru na ha anwabuola ikwuputa okwu mana Scoan machiri ikwu okwu maọbụ katọọ ha. Mmadụ abụọ si na awakporo ha.
Leave a Reply